Jenesis 18:16
Genesis 18:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm,* Ebraham dupụkwara ha.
Genesis 18:16 in English
Genesis 18:16 · Berean Standard Bible
When the men got up to leave, they looked out over Sodom, and Abraham walked along with them to see them off.
Context
14Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” 15Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.”
Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.” 16Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm,* Ebraham dupụkwara ha. 17Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime? 18Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.