Native Bible

Genesis 18:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”

Genesis 18:15 in English

Genesis 18:15 · Berean Standard Bible

But Sarah was afraid, so she denied it and said, “I did not laugh.” “No,” replied the LORD, “but you did laugh.”

Context

13Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ 14Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” 15Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.” 16Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm,* Ebraham dupụkwara ha. 17Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.