Jenesis 16:13
Genesis 16:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”
Genesis 16:13 in English
Genesis 16:13 · Berean Standard Bible
So Hagar gave this name to the LORD who had spoken to her: “You are the God who sees me,*” for she said, “Here I have seen the One who sees me!”
Context
11Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị,
“Ị dị ime ugbu a,
ị ga-amụ nwa nwoke.
Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel
nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị. 12Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ.
Ọ ga-emegide onye ọbụla,
onye ọbụla ga-emegidekwa ya.
Ọ ga-ebi nʼime ibu iro,
megide ụmụnna ya niile.” 13Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.” 14Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị.* Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered. 15Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.