Jenesis 12:9
Genesis 12:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.*
Genesis 12:9 in English
Genesis 12:9 · Berean Standard Bible
And Abram journeyed on toward the Negev.
Context
7Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya. 8Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. 9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.* 10Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ.* Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala* Ijipt, ebe o biri nwa oge. 11Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.