Jenesis 12:8
Genesis 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.
Genesis 12:8 in English
Genesis 12:8 · Berean Standard Bible
From there Abram moved on to the hill country east of Bethel and pitched his tent, with Bethel to the west and Ai to the east. There he built an altar to the LORD, and he called on the name of the LORD.
Context
6Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ. 7Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya. 8Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. 9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.* 10Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ.* Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala* Ijipt, ebe o biri nwa oge.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.