Native Bible

Genesis 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ.* Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala* Ijipt, ebe o biri nwa oge.

Genesis 12:10 in English

Genesis 12:10 · Berean Standard Bible

Now there was a famine in the land. So Abram went down to Egypt to live there for a while because the famine was severe.

Context

8Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. 9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.* 10Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ.* Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala* Ijipt, ebe o biri nwa oge. 11Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma. 12Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.