Native Bible

Genesis 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.

Genesis 12:11 in English

Genesis 12:11 · Berean Standard Bible

As he was about to enter Egypt, he said to his wife Sarai, “Look, I know that you are a beautiful woman,

Context

9Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.* 10Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ.* Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala* Ijipt, ebe o biri nwa oge. 11Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma. 12Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ. 13Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.