Jenesis 12:18
Genesis 12:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị?
Genesis 12:18 in English
Genesis 12:18 · Berean Standard Bible
So Pharaoh summoned Abram and asked, “What have you done to me? Why didn’t you tell me she was your wife?
Context
16Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel. 17Ma Onyenwe anyị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram. 18Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị? 19Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwanyị, si otu a mee m ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Ugbu a, lee nwunye gị, kpọrọ ya laa.” 20Fero nyere iwu banyere Ebram na ndị ikom so ya. Ha zilagara ya, ya na nwunye ya, na ihe niile o nwere.
12:9 Ihe aha a pụtara bụ “ala kpọrọ nkụ.” Nke a bụ nʼihi ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, gbatịa gbadaa ndịda Jerusalem, nʼụzọ ọzara.
12:10 Jen 26:1; 41:56
12:10 Nʼoge a, ụkọ mmiri ozuzo e metụtabeghị ihe ubi nʼala Ijipt, nʼihi na ha na-esite na iyi ha rụrụ na-agba ubi ha mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.