Native Bible

Ezekiel 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”

Ezekiel 8:6 in English

Ezekiel 8:6 · Berean Standard Bible

“Son of man,” He said to me, “do you see what they are doing—the great abominations that the house of Israel is committing—to drive Me far from My sanctuary? Yet you will see even greater abominations.”

Context

4Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu. 5Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya. 6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.” 7O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ. 8Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.