Izikiel 8:4
Ezekiel 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.
Ezekiel 8:4 in English
Ezekiel 8:4 · Berean Standard Bible
And there I saw the glory of the God of Israel, like the vision I had seen in the plain.
Context
2Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa. 3Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo. 4Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu. 5Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya. 6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.