Native Bible

Ezekiel 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa.

Ezekiel 8:2 in English

Ezekiel 8:2 · Berean Standard Bible

Then I looked and saw a figure like that of a man. From His waist down His appearance was like fire, and from His waist up He was as bright as the gleam of amber.*

Context

1Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ. 2Ahụrụ m oyiyi yiri mmadụ. Akụkụ oyiyi a nke dị site nʼụkwụ ya ruo nʼala ya na-acha dịka ọkụ, sitekwanụ nʼụkwụ ya rigoo, ọ na-egbu nnọọ amụma dịka nkume amba dị oke ọnụahịa. 3Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo. 4Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.