Izikiel 8:5
Ezekiel 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya.
Ezekiel 8:5 in English
Ezekiel 8:5 · Berean Standard Bible
“Son of man,” He said to me, “now lift up your eyes to the north.” So I lifted up my eyes to the north, and in the entrance north of the Altar Gate * I saw this idol of jealousy.
Context
3Oyiyi a setịpụrụ ihe dịka aka mmadụ, jiri ya jide m nʼagịrị isi m. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu nʼetiti ala na mbara eluigwe. Nʼime ọhụ nke Chineke, o buuru m jee Jerusalem, nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼugwu, nʼime ogige ya, ebe arụsị ahụ na-akpasu ekworo guzo. 4Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu. 5Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya. 6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.” 7O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.