Izikiel 40:2
Ezekiel 40:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ.
Ezekiel 40:2 in English
Ezekiel 40:2 · Berean Standard Bible
In visions of God He took me to the land of Israel and set me on a very high mountain, on whose southern slope was a structure that resembled a city.
Context
1Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ. 2Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ. 3O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya. 4Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.