Izikiel 40:4
Ezekiel 40:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.”
Ezekiel 40:4 in English
Ezekiel 40:4 · Berean Standard Bible
“Son of man,” he said to me, “look with your eyes, hear with your ears, and pay attention to everything I am going to show you, for that is why you have been brought here. Report to the house of Israel everything you see.”
Context
2Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ. 3O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya. 4Nwoke ahụ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, lezie anya nke ọma, gekwaa ntị tinyekwa ihe niile m gaje igosi gị nʼobi, nʼihi na-akpọtara m gị nʼebe a nʼihi ka ịhụ ihe ndị a. Gwakwa ụmụ Izrel ihe niile ị hụrụ.” 5Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ.* Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara. 6Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.