Native Bible

Ezekiel 40:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.

Ezekiel 40:1 in English

Ezekiel 40:1 · Berean Standard Bible

In the twenty-fifth year of our exile, at the beginning of the year, on the tenth day of the month—in the fourteenth year after Jerusalem had been struck down—on that very day the hand of the LORD was upon me, and He took me there.

Context

1Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ. 2Nʼọhụ dị iche iche Chineke mere ka m hụ, o buuru m gaa nʼala Izrel, debe m nʼelu ugwu dị elu nke ukwu, ebe m nọ hụ ihe dịka obodo a na-ewu ọhụrụ, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu ahụ. 3O mere ka m bịaruo nʼebe ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwoke nke ụdịdị ya na-enwu dịka bronz ka o guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ọ na-ejide eriri akwa ọcha, na osisi e ji atụ ihe nʼaka ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.