Izikiel 4:7
Ezekiel 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
Ezekiel 4:7 in English
Ezekiel 4:7 · Berean Standard Bible
You must turn your face toward the siege of Jerusalem with your arm bared, and prophesy against it.
Context
5Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel. 6“Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ. 7Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya. 8Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo. 9“Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.