Izikiel 4:9
Ezekiel 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
Ezekiel 4:9 in English
Ezekiel 4:9 · Berean Standard Bible
But take wheat, barley, beans, lentils, millet, and spelt; put them in a single container and make them into bread for yourself. This is what you are to eat during the 390 days you lie on your side.
Context
7Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya. 8Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo. 9“Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri. 10A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị. 11A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.