Izikiel 4:5
Ezekiel 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel.
Ezekiel 4:5 in English
Ezekiel 4:5 · Berean Standard Bible
For I have assigned to you 390 days, according to the number of years of their iniquity. So you shall bear the iniquity of the house of Israel.
Context
3Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel. 4“Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị. 5Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel. 6“Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ. 7Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.