Izikiel 4:15
Ezekiel 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
Ezekiel 4:15 in English
Ezekiel 4:15 · Berean Standard Bible
“Look,” He replied, “I will let you use cow dung instead of human excrement, and you may bake your bread over that.”
Context
13Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.” 14Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.” 15Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.” 16Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta. 17Aga m eme ka ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kọọ ha. Ha ga na-elerịta onwe ha anya nʼoke egwu, ha ga-anwụkwa nʼihi mmehie ha.”
4:11 Nke a bụ otu ụzọ site nʼụzọ isii nke e kere otu lita mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.