Native Bible

Ezekiel 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.”

Ezekiel 4:14 in English

Ezekiel 4:14 · Berean Standard Bible

“Ah, Lord GOD,” I said, “I have never defiled myself.* From my youth until now I have not eaten anything found dead or mauled by wild beasts. No unclean meat has ever entered my mouth.”

Context

12Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.” 13Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.” 14Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.” 15Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.” 16Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.