Izikiel 4:13
Ezekiel 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.”
Ezekiel 4:13 in English
Ezekiel 4:13 · Berean Standard Bible
Then the LORD said, “This is how the Israelites will eat their defiled bread among the nations to which I will banish them.”
Context
11A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.* 12Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.” 13Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.” 14Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.” 15Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.