Izikiel 39:16
Ezekiel 39:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
Ezekiel 39:16 in English
Ezekiel 39:16 · Berean Standard Bible
(Even the city will be named Hamonah.*) And so they will cleanse the land.
Context
14A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala.
“ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị. 15Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha. 16Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’ 17“Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara. 18Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.