Izikiel 39:14
Ezekiel 39:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.
Ezekiel 39:14 in English
Ezekiel 39:14 · Berean Standard Bible
And men will be employed to continually pass through the land to cleanse it by burying the invaders who remain on the ground. At the end of the seven months they will begin their search.
Context
12“ ‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha. 13Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 14A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala.
“ ‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị. 15Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha. 16Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.