Native Bible

Ezekiel 33:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.

Ezekiel 33:15 in English

Ezekiel 33:15 · Berean Standard Bible

if he restores a pledge, makes restitution for what he has stolen, and walks in the statutes of life without practicing iniquity—then he will surely live; he will not die.

Context

13Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere. 14Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma, 15ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 16Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ. 17“Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.