Native Bible

Ezekiel 33:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.

Ezekiel 33:17 in English

Ezekiel 33:17 · Berean Standard Bible

Yet your people say, ‘The way of the Lord is not just.’ But it is their way that is not just.

Context

15ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 16Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ. 17“Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi. 18Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya. 19Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.