Native Bible

Ezekiel 33:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,

Ezekiel 33:14 in English

Ezekiel 33:14 · Berean Standard Bible

But if I tell the wicked man, ‘You will surely die,’ and he turns from his sin and does what is just and right—

Context

12“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’ 13Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere. 14Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma, 15ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 16Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.