Izikiel 33:12
Ezekiel 33:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
Ezekiel 33:12 in English
Ezekiel 33:12 · Berean Standard Bible
Therefore, son of man, say to your people: ‘The righteousness of the righteous man will not deliver him in the day of his transgression; neither will the wickedness of the wicked man cause him to stumble on the day he turns from his wickedness. Nor will the righteous man be able to survive by his righteousness on the day he sins.’
Context
10“Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’ 11Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ* ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ* unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’ 12“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’ 13Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere. 14Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.