Native Bible

Ezekiel 33:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ* ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ* unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’

Ezekiel 33:11 in English

Ezekiel 33:11 · Berean Standard Bible

Say to them: ‘As surely as I live, declares the Lord GOD, I take no pleasure in the death of the wicked, but rather that the wicked should turn from their ways and live. Turn! Turn from your evil ways! For why should you die, O house of Israel?’

Context

9Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara. 10“Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’ 11Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ* ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ* unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’ 12“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’ 13Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.