Native Bible

Ezekiel 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.

Ezekiel 30:8 in English

Ezekiel 30:8 · Berean Standard Bible

Then they will know that I am the LORD when I set fire to Egypt and all her helpers are shattered.

Context

6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.* Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi. 8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka. 9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu. 10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.