Izikiel 30:8
Ezekiel 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
Ezekiel 30:8 in English
Ezekiel 30:8 · Berean Standard Bible
Then they will know that I am the LORD when I set fire to Egypt and all her helpers are shattered.
Context
6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,
nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.
Site na Migdol ruo nʼAswan,
ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.*
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,
nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.
Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,
nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi. 8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,
mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka. 9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu. 10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn
bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.