Izikiel 30:10
Ezekiel 30:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
Ezekiel 30:10 in English
Ezekiel 30:10 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: I will put an end to the hordes of Egypt by the hand of Nebuchadnezzar king of Babylon.
Context
8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,
mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka. 9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu. 10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn
bibie igwe ndị agha Ijipt niile. 11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,
ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,
werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ. 12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.
Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.
Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.