Izikiel 29:4
Ezekiel 29:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
Ezekiel 29:4 in English
Ezekiel 29:4 · Berean Standard Bible
But I will put hooks in your jaws and cause the fish of your streams to cling to your scales. I will haul you up out of your rivers, and all the fish of your streams will cling to your scales.
Context
2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt,
gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi.
Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl,
ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.” 4Ma aga m etinye nko nʼagba gị,
mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile,
mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị. 5Aga m ahapụ gị
na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,
ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,
a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,
nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri
nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile. 6Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
“ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.