Izikiel 29:3
Ezekiel 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
Ezekiel 29:3 in English
Ezekiel 29:3 · Berean Standard Bible
Speak to him and tell him that this is what the Lord GOD says: Behold, I am against you, O Pharaoh king of Egypt, O great monster who lies among his rivers, who says, ‘The Nile is mine; I made it myself.’
Context
1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt,
gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi.
Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl,
ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.” 4Ma aga m etinye nko nʼagba gị,
mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile,
mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị. 5Aga m ahapụ gị
na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,
ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,
a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,
nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri
nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.