Izikiel 27:24
Ezekiel 27:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
Ezekiel 27:24 in English
Ezekiel 27:24 · Berean Standard Bible
In your marketplace they traded with you fine garments of blue, embroidered work, and multicolored rugs with cords tightly twisted and knotted.
Context
22“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ. 23“ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị. 25“ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish
bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.
I jupụtara nʼihe ahịa,
gị obodo dị nʼetiti mmiri. 26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị
na-ebuba gị nʼosimiri.
Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ
ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.