Izikiel 27:26
Ezekiel 27:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
Ezekiel 27:26 in English
Ezekiel 27:26 · Berean Standard Bible
Your oarsmen have brought you onto the high seas, but the east wind will shatter you in the heart of the sea.
Context
24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị. 25“ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish
bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị.
I jupụtara nʼihe ahịa,
gị obodo dị nʼetiti mmiri. 26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị
na-ebuba gị nʼosimiri.
Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ
ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri. 27Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,
na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị,
ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile,
ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị
ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri,
nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu. 28Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji
mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.