Native Bible

Ezekiel 27:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.

Ezekiel 27:22 in English

Ezekiel 27:22 · Berean Standard Bible

The merchants of Sheba and Raamah traded with you; for your wares they exchanged gold, the finest of all spices, and precious stones.

Context

20“ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ. 21“ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa. 22“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ. 23“ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. 24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.