Izikiel 21:27
Ezekiel 21:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
Ezekiel 21:27 in English
Ezekiel 21:27 · Berean Standard Bible
A ruin, a ruin, I will make it a ruin! And it will not be restored until the arrival of Him to whom it belongs, to whom I have assigned the right of judgment.*’
Context
25“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, 26ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. 27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’ 28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:
“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,
nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.
E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,
ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe. 29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,
na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,
a ga-etinye ya nʼolu
ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,
bụ ndị ụbọchị ha rurula,
ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.