Izikiel 21:26
Ezekiel 21:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.
Ezekiel 21:26 in English
Ezekiel 21:26 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: ‘Remove the turban, and take off the crown. Things will not remain as they are: Exalt the lowly and bring low the exalted.
Context
24“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha. 25“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, 26ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. 27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’ 28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:
“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,
nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.
E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,
ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.