Izikiel 19:12
Ezekiel 19:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile.
Ezekiel 19:12 in English
Ezekiel 19:12 · Berean Standard Bible
But it was uprooted in fury, cast down to the ground, and the east wind dried up its fruit. Its strong branches were stripped off and they withered; the fire consumed them.
Context
10“ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị
a kụrụ nʼakụkụ mmiri,
nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ
nʼihi mmiri ọ na-enweta. 11Alaka ya niile siri ike,
ha topụtara ghọọ mkpara eze.
O topụrụ etopụ,
tokarịa alaka ndị ọzọ elu.
Nke a mere e ji na-ahụ ya anya
site nʼebe dị anya. 12Ma e ji oke iwe hopu ya
tụpụ ya nʼala.
Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa,
meekwa ka mkpụrụ ya daa.
Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị,
ọkụ rechapụkwara ha niile. 13Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara
ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị. 14Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya
na mkpụrụ ya niile.
Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ
nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’
Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.