Native Bible

Ezekiel 19:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.

Ezekiel 19:11 in English

Ezekiel 19:11 · Berean Standard Bible

It had strong branches, fit for a ruler’s scepter. It towered high above the thick branches, conspicuous for its height and for its dense foliage.

Context

9Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa, bute ya nʼihu eze Babilọn. E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu, ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọ nʼugwu niile nke Izrel. 10“ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnị a kụrụ nʼakụkụ mmiri, nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụ nʼihi mmiri ọ na-enweta. 11Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya. 12Ma e ji oke iwe hopu ya tụpụ ya nʼala. Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa, meekwa ka mkpụrụ ya daa. Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị, ọkụ rechapụkwara ha niile. 13Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.