Izikiel 17:3
Ezekiel 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.
Ezekiel 17:3 in English
Ezekiel 17:3 · Berean Standard Bible
and tell them that this is what the Lord GOD says: ‘A great eagle with great wings and long pinions,* full of feathers of many colors, came to Lebanon and took away the top of the cedar.
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ. 3Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo. 4Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ. 5“ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.