Native Bible

Ezekiel 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’

Ezekiel 14:5 in English

Ezekiel 14:5 · Berean Standard Bible

so that I may take hold of the hearts of the people of Israel. For because of their idols, they are all estranged from Me.’

Context

3“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha.* Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla? 4Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị. 5Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’ 6“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ. 7“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.