Izikiel 14:7
Ezekiel 14:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.
Ezekiel 14:7 in English
Ezekiel 14:7 · Berean Standard Bible
For when any Israelite or any foreigner dwelling in Israel separates himself from Me, sets up idols in his heart, and puts a wicked stumbling block before his face, and then comes to the prophet to inquire of Me, I the LORD will answer him Myself.
Context
5Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’ 6“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ. 7“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha. 8Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 9“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.