Izikiel 14:8
Ezekiel 14:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Ezekiel 14:8 in English
Ezekiel 14:8 · Berean Standard Bible
I will set My face against that man and make him a sign and a proverb; I will cut him off from among My people. Then you will know that I am the LORD.
Context
6“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ. 7“ ‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha. 8Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 9“ ‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel. 10Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.