Native Bible

Ezekiel 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha.* Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?

Ezekiel 14:3 in English

Ezekiel 14:3 · Berean Standard Bible

“Son of man, these men have set up idols in their hearts and put wicked stumbling blocks before their faces. Should I consult with them in any way?

Context

1Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m. 2Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, 3“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha.* Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla? 4Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị. 5Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.