Izikiel 1:26
Ezekiel 1:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.
Ezekiel 1:26 in English
Ezekiel 1:26 · Berean Standard Bible
Above the expanse over their heads was the likeness of a throne with the appearance of sapphire, and on the throne high above was a figure like that of a man.
Context
24Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. 25Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. 26Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ. 27Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu. 28Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo.
Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.
1:3 Kaldịa bụkwa Babilọn
1:16 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ị ga-ahụ topaazi
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.