Native Bible

Ezekiel 1:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha.

Ezekiel 1:24 in English

Ezekiel 1:24 · Berean Standard Bible

When the creatures moved, I heard the sound of their wings like the roar of many waters, like the voice of the Almighty,* like the tumult of an army. When they stood still, they lowered their wings.

Context

22A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal. 23Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya. 24Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. 25Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. 26Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.