Ọpụpụ 5:8
Exodus 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’
Exodus 5:8 in English
Exodus 5:8 · Berean Standard Bible
But require of them the same quota of bricks as before; do not reduce it. For they are lazy; that is why they are crying out, ‘Let us go and sacrifice to our God.’
Context
6Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta* ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị, 7“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik* dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha. 8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ 9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.” 10Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.