Native Bible

Exodus 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik* dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.

Exodus 5:7 in English

Exodus 5:7 · Berean Standard Bible

“You shall no longer supply the people with straw for making bricks. They must go and gather their own straw.

Context

5Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.” 6Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta* ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị, 7“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik* dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha. 8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ 9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.