Ọpụpụ 5:9
Exodus 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
Exodus 5:9 in English
Exodus 5:9 · Berean Standard Bible
Make the work harder on the men so they will be occupied and pay no attention to these lies.”
Context
7“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik* dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha. 8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’ 9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.” 10Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ. 11Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.