Ọpụpụ 35:20
Exodus 35:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.
Exodus 35:20 in English
Exodus 35:20 · Berean Standard Bible
Then the whole congregation of Israel withdrew from the presence of Moses.
Context
18ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha, 19uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.” 20Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ. 21Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ. 22Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.